Jụọ Ndigbo bụ webusịtị maka mmuta na asumasu Igbo. Ọ bụ
webusịtị ịgbasa ozi gbasara asụmasụ asụsụ Igbo n'amasị. Ide uri n'asụsụ
Igbo bụ ụzọ esi akọwapụta ntụpịrịko n'ihe gbasara mmụta, ọchịchị, mmekọrịta
mmadụ n'ibe ya, ihụnanya, oji na ọcha, omenala na ọdịnanị.
Kpọọ mụ, Jo. A bụ m nw'afọla Igbo. Ka m n'etolite, echetara m akụkọ d'iche iche nna na nne m, papa nnukwu m, nd'ọgbọ m, omenala, nzụkọ nd'okenye, nke ndị ụmụ ntorobịa, na mmemme d'iche iche nk'obodo m. Ihe ndịa nọ m n'echiche.
Agbụrụ tolitere bụrụ ndị eji
asụsụ bekee wee zụọ. Ka elementịrị skuul, ka sekọndịrị skuul, eji asụsụ bekee
wee kuziere anyị nkuzi d'iche iche. Ọ bụrụ na ịsụọ Igbo na klas, onye nkuzi apịa
gị-ịtarị. Ọ bụ oge ahụ ka m ji mara n'anyị bụ nd'Igbo dị nzuzu.
Ma nzuzu ahụ mere n'ọdịghị
nw'afọ Igbo ọbụla g'asụ Igbo m'ọbụrụ n'otinyeghi ya asụsụ Inglishi. Oge ụfọdụ
ihu onye Igbo k'ọnasụ Igbo, o tinyeghi ya asụsụ Inglishi ịmara n'obidebeghị.
Agbụrụ anyị emego asụsụ Inglishi k'ọbụrụ enyemaka asụsụ Igbo.
Jụọ Ndigbo bụ otu ụzọ nji asụ
Igbo egbochiri m ịsụ na elementịrị, na sekondịrị wee dịrị gaba.
Agụgwọ m ọtụtụ akwụkwọ ụmụ
Igbo dere, dịka:
- Mmadụ ka a na-arịa - Onye dere ya bụ Okeke Chika Jerry
- Akị si na Chi - Onye dere ya bụ Ezejesi N. R.
- Ọsa enwe Akwụ - Onye dere ya bụ Ndụbọdịị Ben Obodo
- Nwata rie Awọ - Onye dere ya bụ Goddy Onyekaọnwụ
- Ọkpa Akụ Eri Eri - Onye dere ya bụ Ude Ọdịlọra
- Mbedịọgụ - Onye dere ya bụ F.C Ọgbalụ
- Nkịta Atakaa Akpa Dibịa - Onye dere ya bụ J.U. Tagbo Nzeakọ
- Mkpụrụ Onye kụrụ - Onye dere ya bụ Ray C. Anene
- Ikuku Kuo ahụ Ike Ọkụkọ - Onye dere ya bụ Stanley-Obilor Stella
- Nze Nwata Chiri - Onye dere ya bụ Okoro Mark Ogbonnaya
- Aka Ekpuchi Eziokwu - Onye dere ya bụ S.N. Okafọ
- Ikwu jie Agụ - Onye dere ya bụ J.U.Tagbo Nzeakọ
Ụmụ Igbo ji obi ọcha wee
n'ekele ụmụnne anyị ndịa ka ha si jisieike n'ịkwalite asụsụ Igbo.
Ihe ọ bụla mmere na webusịtịa
bụ isonye na nzọ-ụkwụ ha. Gụa ma kọtara nwanne gị.